Sunday Igboho sị na ihe dị egwu ga-eme ma ọkọ kọọ Ifeanyi Ejiofor

Sunday Adeyemo bụ onye e ji Sunday Igboho maara adọọla ndị ọrụ nchekwa aka na ntị ka ha hapụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor bụ onye ha wakporọ ụlọ ya n’Anambra Steetị na nso nso a.

Adeyemo sị na site ugbua gawa na ihe dị egwu ga-eme ma ọ bụrụ na ọkọ kọọ Ejiofor, na onye ọbụla aka ya dị na mwakpo ahụ ga-ata ahụhụ ya.

N’akwụkwọ ozi nke Adeyemi wepụtara nke ọnụ na-ekwuru otu Yoruba Nation bụ Oloyemi Koiki wepụtara ụbọchị Wenezde (16/6/2021), binyere aka, ọ kọwara na Ejiofor abụghị naanị ọkaiwu Nnamdi Kanu kama na ọ bụ ọkaiwu Sunday Igbogho nakwa nke Femi Fani-Kayode.

African gods: Nne Miri and Onabuluwa the Progenitors of the Ogbanje Spirit

o kwuru na nke bụ ugboro abụọ ndị ọrụ nchekwa ga-awakpo ụlọ Ifeanyi Ejiofor, na e gburu onye enyemaka ya ma kpọọ ozu ya ọkụ.

Ọ sị na kemgbe nke a mere na ndị ọrụ nchekwa ewepụtabeghi ozi ọbụla ịkọwa ihe mere ha ji wakpoo ụlọ Ejiofor.

Igbogho kpọrọ oku sị ka ndị ọrụ nchekwa tọhapụ ndị niile na-arụ ọrụ n’ụlọ Ejiofor ha nwuchiri na-egbughi oge ọbụla.

Cheta na akụkọ kwuru na ndị e che na ha bụ ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdị Kanụ n’ụbọchi 6 nke ọnwa Juun.

BBC Igbo

Contact Us

Leave a Reply

Fill in your details below or click an icon to log in:

WordPress.com Logo

You are commenting using your WordPress.com account. Log Out /  Change )

Google photo

You are commenting using your Google account. Log Out /  Change )

Twitter picture

You are commenting using your Twitter account. Log Out /  Change )

Facebook photo

You are commenting using your Facebook account. Log Out /  Change )

Connecting to %s